Isaiah 42

Ohu Onyenwe anyị

1“Lee ohu m, onye m na-agba ume,
onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ.
Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya.
Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
2Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa,
maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi.
3Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi
Ya bụ, osisi achara
azọpịara azọpịa,
maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị.
Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
4Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba,
ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa.
Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.”

5Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru,
onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha,
onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta,
onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume,
na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.
6“Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m.
Aga m echebe gị, gbaa gị ume,
nʼihi na eweere m gị nye ndị m
ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike.
Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile.
7Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,
meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.

8“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m.
Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m.
Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m.
9Lee ihe ochie emezuola
ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta.
Tupu ha pụta ìhè
ana m akpọsa ha nye unu.”

Abụ otuto nye Onyenwe anyị

10Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya,
unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa,
unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya.
Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu.
11Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu,
ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ.
Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ,
ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.
12Ka ha nye Onyenwe anyị ebube,
kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu.
13 Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike.
Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha.
Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya,
ma merie ha.

14“Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị;
ejidesịrị m onwe m aka ike.
Ma ugbu a, aga m egosi iwe m;
aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme.
15Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị,
meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ.
Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara,
meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ.
16Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị,
nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha;
Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha,
meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie.
Ihe ndị a niile ka m ga-eme.
Agaghị m agbakụta ha azụ.
17Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi,
ndị na-asị ihe ndị ahụ a pịrị apị, ‘Unu bụ chi anyị,’
a ga-achụghachi ha azụ nʼọnọdụ ihere.

Izrel kpuru ìsì, chie ntị

18“Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri,
leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ.
19Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m?
Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m?
Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì
dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị?
20Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha.
Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”
21 Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu,
meekwa ka ọ dị ebube,
nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè.
22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha.
A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala,
zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche.
Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha,
ma ọ dịghị onye na-anapụta ha.
Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike,
ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.”

23Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a?
Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?
24Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe,
onye were Izrel nyefee ndị ohi?
Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị
onye ha mehiere megide?
Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile,
ha erubeghị isi nye iwu ya.
25Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya,
ihe ike nke agha.
Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya;
o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.
Copyright information for IboBIU